Isaiah 44

Izrel onye a họpụtara

1“Ma ugbu a, gee ntị gị Jekọb, bụ ohu m,
geekwanụ ntị, unu ndị Izrel m họpụtara.
2Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu,
bụ onye kere unu, onye kpụrụ unu nʼime nʼafọ,
na onye ga-enyere unu aka:
Atụla egwu, gị Jekọb,
Maọbụ, Izrel
ohu m,
atụkwala egwu gị Jeshurun, onye nke m họpụtara.
3Nʼihi na aga m eme ka ala ahụ kpọrọ nkụ nweta mmiri,
mee ka mmiri na-asọgharị nʼala ahụ akpịrị na-akpọ nkụ.
Aga m awụkwasị ụmụ ụmụ unu Mmụọ m,
meekwa ka ngọzị m dịrị ha.
4Ha ga-etopụta etopụta dịka ahịhịa a gbara mmiri,
e, dịka osisi pọpla nʼakụkụ iyi jupụtara na mmiri.
5Ha ga-eji nganga sị, ‘Abụ m nke Onyenwe anyị,’
maọbụ ‘Abụ m nwa nwa Jekọb,’
ebe ndị ọzọ ga-edepụta nʼaka ha, ‘Nke Onyenwe anyị ka m bụ,’
ha ga-agụkwa onwe ha Izrel.

Onyenwe anyị, ọ bụghị arụsị

6“Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu,
onye bụ Eze Izrel na Onye mgbapụta ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile:
Mụ onwe bụ Mmalite na Ọgwụgwụ;
ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ewezuga m.
7Ọ bụkwa onye dị ka m? Ya kwupụta ya.
Ya kwupụta ya, doo ya nʼusoro ka ntị nụrụ!
Ya kwupụta ihe niile mere kemgbe m mere ka ndị m guzosie ike.
Ya kwupụtakwa, ma dokwaa ha nʼusoro,
ihe niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu.
8Unu atụla egwu. Unu amakwala jijiji.
Ọ bụ na m akọpụtaghị ihe ndị a ma kwupụta ha nʼoge gara aga.
Unu onwe unu bụ ndị akaebe m. Ọ dị chi ọzọ dị ma e wezuga m?
Mba! O nweghị Oke nkume ọzọ dị, nke m maara ihe banyere ya.”

9Ndị a niile na-apị arụsị bụ ndị nzuzu.
Chi ndị ahụ niile ha na-agụ dị ka ihe ukwu bụkwa ihe na-enweghị isi.
Ndị niile na-akpọ isiala nye chi ndị a bụ ndị kpuru ìsì,
na ndị amamihe kọrọ, ndị ihere ga-emekwa.
10Ọ baghị uru mmadụ ịkpụrụ onwe ya arụsị maọbụ chi a pịrị apị,
nke na-apụghị inyere ya aka nʼụzọ ọbụla?
11Lee ihere ga-eme ndị niile na-akpọ isiala nye ya.
Ndị kpụrụ ha bụ naanị ndị mmadụ.
Ka ha niile chịkọta onwe ha, guzo, nwee mkpebi ha,
ha ga-anọ nʼọnọdụ nʼihere, na nʼoke egwu.

12Ọkpụ ụzụ na-ewere ngwa ọrụ ya
na-ahụ ya nʼime icheku ọkụ,
ọ na-eji mkpirisi igwe onye ọka tipịa ya nʼụdịdị arụsị,
ọ bụ ike nke ogwe aka ya ka o ji akpụ ụzụ.
Agụ na-agụ ya, ike na-agwụsịkwa ya;
ọ ṅụghị mmiri ọbụla, ọ na-adakwa mba.
13Onye ọka osisi na-esite nʼeriri ọtụtụ tụpụta osisi
were pensụlụ kaa ya;
ọ na-ewere ngwa ọrụ ya kpụchaa osisi ahụ,
were ngwa ọrụ ịka akara, kaa ya akara.
Ọ na-arụ ya dịka oyiyi mmadụ,
oyiyi mmadụ nʼịma mma ya niile,
maka ibi nʼime ụlọ arụsị.
14Ọ na-egbutu osisi sida dị iche iche,
maọbụ osisi saipres ma ọ bụkwa osisi ook.
Ọ na-ahapụ ya ka o too nʼetiti osisi dị iche iche nke oke ọhịa,
maọbụ kụọ osisi fịa, nke mmiri ozuzo na-eme ka o too nke ọma.
15Ọ bụkwa nkụ ka eji ya e mere;
ụfọdụ ka ọ na-ewere nya ọkụ,
ọ na-eji ya afụnwu ọkụ ghee achịcha.
Sitekwa na ya pịa chi, kpuo ihu nʼala nye ya;
ọ na-emekwa arụsị apịrị apị, kpọọ isiala nye ya.
16Ọkara nʼime osisi ndị a ka o ji emenwu ọkụ;
nʼelu ya kwa ka ọ na-esi nri ya,
ọ na-ahụnye anụ, were tajuo afọ ya.
Nkụ ahụ ka o ji anya ọkụ na-asị,
“Ahaa, ahụ ekpola m ọkụ; ahụla m ọkụ.”
17Ihe fọdụrụ nʼime osisi ahụ ka ọ na-ewere kwaara onwe ya arụsị a pịrị apị;
Ọ na-ada nʼala nʼihu ya, fee ya ofufe.
Ọ na-ekpekwara ya ekpere na-asị,
“Biko, Zọpụta m, nʼihi na chi m ka ị bụ!”
18Ha amaghị ihe ọbụla; ha adịghị aghọtakwa,
nʼihi na-emechiela anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ,
mechiekwa uche ha, ka ha ghara ịghọta.
19Ọ dịghị onye na-anọdụ chee echiche,
ọ dịghịkwa onye nwere ihe ọmụma maọbụ nghọta ị sị,
“Ụfọdụ nʼime osisi a ka m ji kwanye ọkụ,
Ọ bụladị ghee achịcha nʼelu icheku ọkụ ya,
ejikwa m ụfọdụ nʼime ya hụọ anụ m tara.
M ga-esite na nke fọdụrụ mepụta ihe rụrụ arụ?
Ọ bụ ogwe osisi ka m ga-akpọ isiala nye?”
20Onye na-adịghị eche ụdị echiche a bụ onye nzuzu, nke na-eji ntụ si nʼebe a kwanyere ọkụ na-azụ onwe ya.
Ọ pụghị ịnapụta onwe ya, maọbụ jụọ onwe ya ajụjụ sị,
“Ihe a m ji nʼaka m, nke m na-akpọ chi, ọ bụghị okwu ụgha ka ọ bụ?”

21“Cheta ihe ndị a, gị Jekọb,
nʼihi na gị bụ Izrel, ị bụ ohu m.
Ọ bụ m kpụrụ gị, ị bụ ohu m;
gị bụ Izrel, agaghị m echezọ gị.
22Ehichapụla m njehie gị niile; dịka igwe ojii,
hichapụkwa mmehie gị dịka igirigi ụtụtụ.
Lọghachikwute m,
nʼihi na akwụọla m ụgwọ ịgbapụta gị.”

23Bụọnụ abụ oke ọṅụ, unu eluigwe, nʼihi na Onyenwe anyị emeela ya;
tienụ oke mkpu, unu ụwa dị nʼala.
Tienụ mkpu ọṅụ, unu ugwu niile,
unu bụ oke ọhịa niile na osisi ọbụla nke dị nʼime gị,
nʼihi na Onyenwe anyị agbapụtala Jekọb,
na-egosikwa ebube ya nʼIzrel.

A ga-ebikwa na Jerusalem

24“Otu a, Onyenwe anyị na-ekwu,
Onye mgbapụta unu, onye ahụ kpụrụ unu nʼime afọ:

Mụ onwe bụ Onyenwe anyị,
Onye kere ihe niile,
onye gbatipụrụ eluigwe,
onye gbasara ụwa naanị mụ onwe m,
25onye na-emebi ihe ịrịbama niile nke ndị amụma ụgha
na-emekwa ka ndị na-ajụta ase ghọọ ndị nzuzu,
onye na-ekpu ihe ọmụmụ ndị maara ihe ihu nʼala
tụgharịa ya, ha ghọọ ihe nzuzu,
26onye na-eme ka okwu ndị ohu ya mezuo
meekwa ka amụma ndị ozi ya buru mezuo,

onye na-asị banyere Jerusalem, ‘A ga-ebikwa nʼime ya ọzọ,’
na-asịkwa banyere obodo niile nke Juda, ‘A ga-ewughachi ha,’
banyere mkpọmkpọ ebe ha niile, ‘Aga m ewulikwa ha.’
27Onye ahụ na-asị, ogbu mmiri, ‘Takọrọ,
aga m emekwa ka iyi ya niile takọrọsịa,’
28Onye na-asị banyere Sairọs, ‘Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m,
ọ ga-emezukwa ihe niile na-adị m mma;
Ọ ga-asịkwa banyere Jerusalem, “Ka ewugharịa ya,”
ma banyere ụlọnsọ, “Ka ehiwe ntọala ya.” ’
Copyright information for IboBIU